Isaiah 22

Amụma e buru banyere Jerusalem

1Amụma megide ndagwurugwu nke ọhụ.

Ọ bụkwa gịnị na-eme unu ugbu a
nke mere na unu niile rịgooro nʼelu ụlọ?
2Gị obodo jupụtara nʼoke ọgbaaghara,
gị obodo oke ụzụ na-aṅụrị obi ụtọ?
Ndị unu niile nwụrụ anwụghị nʼime ọgbọ agha,
ma ọ bụkwanụ site na mma agha.
3Ndịisi unu niile agbapụchaala.
Maọbụ, agbaala ọsọ

E jidechara ha niile na-enweghị àkụ ọbụla a gbapụrụ.
Unu niile e jidere ka a dọkpụụrụ nʼotu dịka ndị mkpọrọ
bụ ndị ahụ gbapụrụ ọsọ mgbe ndị iro ka nọrịị ebe dị anya.
4Nʼihi nke a, asịrị m, “Lepụnụ m anya ka m nọọrọ onwe m;
ka m bee akwa dị ilu.
Unu anwakwala ịkasị m obi,
nʼihi mbibi e bibiri ndị m.”

5Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee otu ụbọchị
ụbọchị ọgbaaghara na nzọda na ihe nke ịgba mmadụ gharịị,
nʼime ndagwurugwu nke ọhụ,
ọ bụ ụbọchị itida mgbidi
na nke itiku ugwu niile mkpu akwa.
6Elam bu akpa àkụ,
ya na ndị nọkwasịrị nʼelu ụgbọala na ịnyịnya ha;
Kia ewepụtakwala ọta.
7Ụgbọala jupụtara na ndagwurugwu unu niile mara mma;
ndị na-agba ịnyịnya anọchisiela ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼobodo unu.

8Onyenwe anyị wezugara ihe nchedo niile nke Juda,
nʼụbọchị ahụ unu legidere anya
na ngwa agha dị nʼỤlọeze dị nʼOke ọhịa.
9Unu hụrụ na mgbidi obodo Devid
nwere ọtụtụ mgbawa nʼebe dị iche iche na ya.
Unu chekọtara mmiri
nʼọdọ mmiri nke ala ala.
10Unu gụrụ ụlọ dị na Jerusalem ọnụ,
tiwaa ụfọdụ ụlọ iji mee ka mgbidi sie ike.
11Unu gwuru ọdọ mmiri nʼetiti mgbidi abụọ
maka ichekwa mmiri si nʼọdọ mmiri ochie,
ma unu elekwasịghị Onye ahụ kere ya anya,
unu ejikwaghị Onye ahụ tụrụ atụmatụ ya site na mgbe gara aga kpọrọ ihe.

12Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
kpọrọ unu ụbọchị ahụ
ka unu kwaa akwa, ruo ụjụ,
kpụchaa agịrị isi unu ma yirikwa akwa mkpe.
13Ma lee, e nwere obi ụtọ, na-egwuri egwu;
igbu ehi na igbu atụrụ,
iri anụ nakwa ịṅụ mmanya.
Unu na-asị, “Ka anyị rienụ, ṅụọkwanụ,
nʼihi na echi ka anyị ga-anwụ.”
14 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpugheerala m mee ka m nụrụ, “Nʼezie, agaghị ekpuchiri unu mmehie a ruo ụbọchị unu ga-anwụ.” Ọ bụ ihe Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.

15Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwuru:

“Gaa, gwa odozi akụ a bụ Shebna,
nke bụ onye na-elekọta ụlọ ukwu eze:
16Gịnị ka ị na-eme nʼebe a, onye nyekwara gị ikike
na i gwuwaara onwe gị ili nʼebe a,
na-egwuwakwa ili gị nʼebe dị elu
na-akapụtara onwe gị ebe izuike nʼime nkume ahụ?

17“Kpachara anya, Onyenwe anyị na-aga ịkpata gị aka,
tufuo gị nʼebe dị anya, gị dike na nwoke.
18Ọ ga-afịkọta gị okirikiri dịka bọlụ,
tufuo gị nʼobodo sara mbara.
Nʼebe ahụ ka ị ga-anọ nwụọ,
nʼebe ahụ kwa ka ụgbọala gị nke i ji anya isi
ga-aghọ ihe ihere nye ezinaụlọ onyenwe gị.
19Onyenwe anyị ga-achụpụkwa gị site nʼọkwa gị,
na sitekwa nʼọnọdụ gị dị elu, dọda gị nʼala.
20“Nʼụbọchị ahụ, aga m akpọ ohu m, Eliakịm, nwa Hilkaya. 21Aga m eyikwasị ya uwe ọrụ gị, kekwasịkwa ya ihe ike nʼukwu, werekwa ike ọchịchị ahụ i nwere na mbụ nyefee ya. Ọ ga-abụkwara ndị Jerusalem na ndị Juda nna. 22Aga m enyefekwa ya nʼaka ihe ntụghe ụzọ nke ụlọ Devid. A ga-emeghe ihe niile ọ sị na a ga-emeghe, mechiekwa ihe niile ọ sị na a ga-emechi, 23Aga m eme ka o guzosie ike dịka ǹtu a kpọgidere nʼaja ụlọ. Ocheeze ya ga-ewetara ụlọ nna ya nsọpụrụ. 24A ga-ekokwasị ya ebube nke ezinaụlọ ya, ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya, ihe niile nke dị nta, site na ite na efere, sitekwa nʼọba ruo na karama niile.

25“Nʼụbọchị ahụ,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri, “Nʼoge ahụ, ǹtu ahụ a kpọgidesịrị ike nʼaja ụlọ ga-apụ nʼọnọdụ ya, a ga-akpajipụ ya ọ dapụ nʼala. Ibu niile nke kokwasịrị nʼelu ya ka a ga-egbuda nʼala.” Nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola ya.

Copyright information for IboBIU